Igbo Traditional marriage: Lee obodo e ji naanị naịra iri abụọ …

Nnamdi Agbanelo

0

Video Editor

Videographer

Video Producer

Adobe Audition

Final Cut Pro

Igbo Traditional marriage: Lee obodo e ji naanị naịra iri abụọ na ise alụ nwaanyị n'ịgbankwụ
Ịlụ nwaanyị n'ala Igbo so n'emume kachasị oke mkpa.
Ụfọdụ na-ahụta ya ka ihe dị omimi ma dịkwa oke ọnụ.
Mana o were anya na ihe kachasị eri ego n'alụm nwaanyị n'ala Igbo bụ nri na mmanya a na-enye ndị ọgọ.
Nke ahụ abụghị iwu, mana e kwesiri inye ndị bịara gị mmeme ihe oriri na ihe ọṅụṅụ dịka aka ha onye na-eme ihe.
N'omenala Igbo, ụgwọ isi nwaanyị bụ ihe kachasị mkpa n'emume ịlụ nwaanyị.
Ihe a na-akwụ n'isi nwaanyị dị iche iche dịka omenala ndị sị dị.
N'Arochukwu ugwu isi nwaanyị bụ ọkwa isii, nke pụtara naịra iri abụọ na ise (N25.00).
Mana ọ bụghị ya bụ naanị egọ a na-emefu n'ịlụ nwaanyị ebe ahụ.
Ihe ndị ọzọ na-erikwa ego bụ ihe a na-enye ụmụnna na ndị ikwu na ibe.
Ihe ndị a dịkwa iche iche dịka omenala ndị si dị.
Mana ugbua, ndị ụfọdụ na-etinye ihe na-adibughị n'akwụkwọ omenala ndị obodo ha, ọkachasị ma ha hụ na onye chọrọ ịlụ nwa ha nwaanyị nwere ego.

Ole ndị bụ ndị Arochukwu?

Arochukwu bụ obodo dị n'Abia Steeti, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ebe ndị ka n'ọnụgụgụ bụ ndị Igbo.
Ọ bụ obodo a ma ama mgbe gboo n'ọdịnala nakwa ntọnala Igbo.
Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ e ji mara arọ bụ arụsị ha a na-akpọ Ibini Ụkpabị.
Ọ bụ arụsị a ka ndị bekee na-akpọ 'Long Juju'.
N'ihi agha, ịgba ohu, ọrụ ugbo nakwa ihe ndị ọzọ, ọtụtụ ndị Arochukwu pụrụ gbasaa n'ala Igbo niile.
Taa, na steeti dị icheiche n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, a ga ahụrịrị obodo ndị mgbọrọgwụ ha si n'Arochukwu.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Nnamdị Agbanelo
Like this project
0

Posted Sep 5, 2023

Lee usoro omenala Bekee kpọrọ 'traditional marriage' e ji alụ nwaanyị n'ala Igbo

Likes

0

Views

0

Clients

BBC

Tags

Video Editor

Videographer

Video Producer

Adobe Audition

Final Cut Pro

Cambridge Arcade
Cambridge Arcade
Sefton Council on Instagram: “Did you take part in National Cyc…
Sefton Council on Instagram: “Did you take part in National Cyc…
K.F.A.C.T.s on Instagram: “Gaze into the enchanting eyes of cat…
K.F.A.C.T.s on Instagram: “Gaze into the enchanting eyes of cat…
K.F.A.C.T.s on Instagram: “By age 27, you should be old enough …
K.F.A.C.T.s on Instagram: “By age 27, you should be old enough …